Jeremiah 4

1“Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri,
mụ ka ị ga-alọghachikwute,”
“Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m,
hapụ isi ebe m nọ kpafuo,
2ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume
ṅụọ iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’
mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya
nyakwaa isi nʼime ya.”
3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị,

“Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị;
unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.
4Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị,
biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu,
unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem
ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ,
nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere,
ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya.

Mbibi si nʼugwu na-abịa

5“Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị,
‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’
Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya.
Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa
gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike.
6Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn!
Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge!
Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi
na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.”

7Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta,
ka onye a na-ebibi mba niile si abịa.
Ọ hapụla ebe obibi ya,
na-abịa ịla Juda nʼiyi.
Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda,
ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.
8Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe;
kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa,
nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị
nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.

9“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba;
ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja,
otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”
10Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.”

11Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, 12ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.”

13Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii.
Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe,
ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo.
Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!
14Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị.
Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?
15Otu olu na-akpọsa site na Dan,
ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.
16“Gwa mba niile otu a, ha abịala,
kpọsaa banyere Jerusalem:
‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya,
na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.
17Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche,
nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
18“Ụzọ gị na omume gị niile
buteere gị ihe ndị a.
Nke a bụ ntaramahụhụ gị.
Lee ka o si dị ilu!
Lee ka o si emibanye nʼime obi.”

19Ihe mgbu a dị ukwuu.
Lee na apụghị m ịnagide ya.
Obi m o, obi m o!
Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim.
Apụghịkwa m ịnọ jụụ.
Ana m anụ ụda opi ike,
na-anụkwa ụzụ agha.
20Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu,
lee na a laala ala a niile nʼiyi.
Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile;
a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.
21Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ?
Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?

22“Ndị m bụ ndị nzuzu,
ha amaghị m.
Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche,
ha enweghị nghọta ọbụla.
Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume,
ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”

23Elere m anya nʼụwa
hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu,
leekwa anya na mbara eluigwe,
ma o nweghị ìhè dị ya.
24Elere m anya nʼugwu ukwu,
hụ na ha na-ama jijiji,
leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.
25Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla,
ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.
26Ala ọma ahụ aghọọla ọzara,
obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe
nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.
27Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru,

“A ga-ebibi ala ahụ niile,
ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.
28Ụwa ga-eru ụjụ,
mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.
Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m.
Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”

29Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha
mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso.
Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa;
ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu.
Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu,
mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.

30Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya?
Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie,
were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu?
Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu?
Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma.
Ndị iko unu na-elelị unu;
ndụ unu ka ha na-achọkwa.

31Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme,
ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya.
Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike.
Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị,
“Onye nwụrụ anwụ ka m bụ!
Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
Copyright information for IboBIU